Micah 4

Ugwu Onyenwe anyị

1Nʼụbọchị ikpeazụ,

ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere
dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile,
a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile,
ndị dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
2Ọtụtụ mba ga-abịa ma sịkwa,

“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị,
ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ
Maọbụ, ụkpụrụ
ya niile,
ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”
Iwu ga-esi na Zayọn pụta,
okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.
3Ọ ga-ekpe ikpe dị nʼetiti ndị dị iche iche,
doziekwa esemokwu dị nʼetiti mba na mba ibe ya ruo ebe dị anya.
Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile, mee ka ha bụrụ mma oge,
kpụgharịkwa ùbe ha ka ha ghọọ mma ịkwacha osisi.
Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,
maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
4Onye ọbụla ga-anọdụrụ onwe ya nʼokpuru vaịnị
na nʼokpuru osisi fiig ya,
nʼihi na o nweghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu ọzọ.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya.
5Mba dị iche iche ga-agagharị
nke ọbụla nʼaha chi ya,
ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị,
bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.

Nzube Onyenwe anyị

6“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“aga m achịkọta ndị ngwụrọ,
chịkọtaa ndị ahụ niile e mere ka ha biri na mba ọzọ,
na ndị ahụ niile m mere ka ha ruo ụjụ.
7Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ,
meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike.
Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha
site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
8Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ,
ugwu nke nwaada Zayọn,
ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị;
bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.”

9Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike?
Ọ bụ na i nweghị eze?
Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla
nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme?
10Susie ude ike, gị nwaada Zayọn,
dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme,
nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a
jee biri nʼọhịa.
Unu aghaghị ịga Babilọn,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu.
Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu
site nʼaka ndị iro unu.

11Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla
imegide gị;
na-asị, “Ka e merụọ ya
ka anya anyị ṅụọ Zayọn.”
12Ma ha amaghị
ihe bụ uche Onyenwe anyị,
ha aghọtakwaghị nzube ya,
na ọ chịkọtala ha dịka ukwu ọka, na-ebuga ha nʼebe ịzọcha ọka.
13“Bilie, zọchaa, gị nwaada Zayọn,
nʼihi na aga m enye gị mpi igwe.
Aga m enyekwa gị ụkwụ ọla bronz,
ị ga-etijisikwa ọtụtụ mba.
Uru ha niile, nke ha nwetara nʼụzọ na-ezighị ezi, ka ị ga-enye Onyenwe anyị.
Akụnụba ha ka ị ga-enyekwa Chineke nwe ụwa niile.”
Copyright information for IboBIU